Mmegide :Njide nke onye isi ndị agha na-emebi nkwekọrịta udo na ndida Sudan.
Chigo deziri ya n'Igbo.
Mmegide :Njide nke onye isi ndị agha na-emebi nkwekọrịta udo ndida Sudan bụ “oke mmebi” nke nkwekọrịta udo nke kwụsịrị agha obodo afọ ise, nke onye ọnụ na-ekwuchitere mmegide kwuru.
N’isi izu a ka ejidere Gabriel Duop Lam onyeisi ndi agha na ndida Sudan ya na ndị isi ndị ọzọ nke(SPLM-IO) Sudan People’s Liberation Movement in Opposition na bekee .
Ndị ejidere bụ ndị jikọrọ osote onye isi ala Riek Machar, onye esemokwu ya na Onye isi ala Salva Kiir kpalitere agha jọgburu onwe ya na n’afo 2013.
Okwuchitere Machar kwuru n’ụtụtụ Tọzdee,na ndị SPLM-IO amaghị ka ndị ọrụ ha nọ ma ọ bụ ebe a na-ejide ha.
Akụkọ kwuru na Puok Abụọ Baluang kwuru “Anyị na-eme ike anyị niile iji zere ọgba aghara ọ bụla na ọnọdụ ahụ, n’agbanyeghị na anyị chọrọ ndị mmekọ anyị n’udo iji gosipụta ọchịchọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị iji jide n’aka na obodo a agaghị alaghachi agha ọzọ,”.
Na ndida Sudan onye isi ala Kiir siri ọnwụ na agaghị alaghachi n’agha, ọnụ na-ekwuchitere gọọmentị Michael Makuei gwara ndị nta akụkọ na isi obodo Juba na Wednezde.
Makuei gbakwụnyere na ejidere ndị mmegide ahụ n’ihi na “ha megidere iwu.”
E kewapụrụ ndida Sudan na Sudan na 2011. Ma nanị afọ abụọ ka e mesịrị, agha obodo dara mgbe Kiir chụrụ ụlọ ọrụ ya dum ma boro Machar ebubo na ọ kpalitere ọchịchị mgbagha.
Leave a Reply