Take a fresh look at your lifestyle.

Zelensky ekwela nkwa imezi ọnọdụ ya na Onyeisiala Trump iji malite mkparịtaụka udo

0 165

Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky ekwela nkwa imezi ọnọdụ ya na Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump iji malite mkparịtaụka udo.

Onyeisiala Zelensky kwuru na ya dị njikere ịrụ ọrụ n’okpuru “ọchịchị siri ike nke Onyeisiala Trump iji weta udo na-adịgịde adịgịde dịka ọ gafere mkpụrụ ụbọchị ole na ole ya na Onyeisiala Trump nwechara nzukọ dara ụda n’obi ọchịchị ‘Oval Office’ dị na White House.

Onyeisiala Yukren kwupụtara nwute banyere ihe mere n’etiti ya na Onyeisiala Trump na White House n’ime ozi o wepụtara n’akara soshịa midia ya n’abalị ụbọchị mba Amerịka kwupụtara atụmatụ ịkwụsị enyemaka ndịagha mba Amerịka na-enye Yukren.

Onyeisiala Zelensky kwuru na oge erugo iji emezi ihe nke ọma dịka Onyeisiala Trump boro ya ebubo na ọ dịbeghị nkwadobe inwe mkparịtaụka.

O kwupụtara na usoro nke mbụ agha ya na Rọshịa nwere ike iji akwụsị nke gụnyere ịtọhapụ ndị mkpọrọ ya na ịkwụsị ịtụ ogbunigwe na ịkwa mgbọ dị iche iche n’ụlọ ebe ndị nkịtị bi, n’ikuku ma n’ime oke osimiri ma ọ burụ na mba Rọshịa ga-emekwa otu ihe ahụ.

O kwukwara na ya na mba Amerịka ga-arụkọ ọrụ iji nweta nkwekọrịta siri ike.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *