Take a fresh look at your lifestyle.

Ndị uweojii anwụchiela ndị ntọọ mmadụ anọ n’Imo steeti

0 149

Ndị uweojii Imo steeti anwụchiela mmadụ anọ a na-enyo enyo n’aka ha dị n’ịtọọ mmadụ na steeti ahụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Henry Okoye kwuru na anwụchiri mmadụ anọ ahu n’obodo a na-akpọ Irete nke dị n’okporo ọchịchị Owerri West dịka Ndị uweojii mechara nnyocha nwere chọpụta ebe ndị ntọọ ahụ nwere ọnọdụ n’ime ọhịa Irete.

Mmadụ anọ ndị ahụ gụnyere Sulieman Ahmed onye dị afọ iri abụọ na isii (26), Mohammed Salisu dị afọ iri atọ na otu (31), ya na Gambo Jefta dị afọ iri abụọ na isii (26). Ha atọ bụ ụmụamaala Jigawa steeti ebe onye nke anọ bụ Gabriel Ogbuzuru bụ nwaamala Ebonyi steeti.

O kwuru na Ndị uweojii nwetere egbe nwere mgbọ isii na mma atọ n’ebe ndị ntọọ ahụ na-ezo n’ime ọhịa. O kwukwara na ndị ahụ a na-enyo enyo ga-anọ n’ụlọ mkpọrọ were ruo mgbe a ga-akpụpụ ha ụlọikpe.

N’aka nke ọzọ, Kọmishọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ Aboki Danjuma na ndị uweojii ndị ọzọ nwụchiri ndị ọzọ a na-enyo enyo gbara ọsọ n’ụbọchị Tuzde abali ato nke onwa Maachị 2025.

Kọmishọna ndị uweojii gara n’ihu kwe ndị mmadụ nkwa na ndị uweojii ga-eme ihe ọ bụla dị n’ike aka ha ịhụ na-achọpụrụ ndị omekome na steeti ahụ.

Ọ kpọkụrụ ndị mmadụ ka ha nyere ndị uweojii aka site na-ịgba ama ndị ọ bụla a na-enyo enyo n’aka ha dị n’ịtọọ ndị mmadụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *