Take a fresh look at your lifestyle.

Yukren ekwetala ịnye mba Amerịka ikike inwere ihe ha sitere n’okike dị n’ime ala

0 301

Ndị ọchịchị mba Yukren kwuru na Yukren ekwetala ịnye mba Amerịka ikike inwere ihe sitere n’okike dị n’ime ala.

Ha gwara ndi ntaakuko na mba Yukren kwetara nkwekọrịta nke mba Amerịka nyere ha mana ha mere ọtụtụ mgbanwe n’ime ya ka o nwere wetara ha ihe ọma n’ọdịnaihu.

Akụkọ mgbasa ozi kwuru na mba Amerịka ewepụla arịrịọ mbụ nke chọrọ ka Amerịka nweta ikike nke ruru narị ijeri ise dọla ($500bn) na ego ha ga-enweta site na iji akụ sitere n’okike mana ha enyeghị mba Yukren nọ n’agha ikike nchekwa siri ike.

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump kwuru na ya na-atụ anya na Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky ga-abịa Amerịka ka ha abụọ binye aka n’akwụkwọ nke nkwekọrịta ahụ.

Na-ekwughị ma nkwekọrịta a bụ eziokwu, Onyeisiala Trump kwuru n’ụbọchị Tuzde abali iri abuo na ise nke onwa Febụwarị 2025, na ihe mba Yukren ga-enweta na nkwekọrịta a bụ ikike ịlụ ọgụ na-aga.

Ọ gwara ndị ntaakụkọ na ndị Yukren nwere obi ike nnukwu mana ọ bụrụ na ọgbụghị maka mba Amerịka, ego ya na ngwa agha ya, agha a gaara agwụ n’oge dị mkpirikpi.

Mgbe a jụrụ ya ma mba Amerịka ọ ka ga na-ezigara Yukren ngwa agha na mgbọ, o kwuru na o nwere ike nwee ruo mgbe Amerịka na Rọshịa ga-enwe nkwekọrịta. “Anyị kwesịrị inwe nkwekọrịta, ma ọ bụghị ya, ọgụ ga-aga n’ihu,”.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *