Kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi n’Anambra steeti bụ Law Mefor akatọọla akụkụ na-efegharị na soshịa midia nke kwuru na Gọọmentị Anambra steeti ga-akpụpụ ndị dibịa awụchiri na steeti ahụ ụlọikpe n’oge na-anadịghị anya.
Mefor gwara ndi ntaakuko na gọọmentị emechabeghị nnyocha banyere ndị dibịa ha ji eji.
O kwuru na ọ bụ mgbe ha mechara nnyocha ahụ ka ha ga-akpụpụ ndị a chọpụtara na e nwere ihe akaebe zuru oke iji kpụpụ ha ụlọikpe.
Mefor kwuru na a ga-atọhapụ ndị a chọpụtara n’aka ha dị ọcha.
“Ọ bụghị akpụpụchaa ndị dibịa ahụ anyị ji eji ụlọikpe tupu e mebe nnyocha, nke a mere anyị ji eme nnyocha tupuu a kpụpu ha ụlọikpe,” Mefor kwuru.
Cheta na akụkọ anyị amaghị maọbụ eziokwu kwuru na gọọmentị Anambra steeti ga-akpụpụ ndị dibịa ahụ a wụchiri maka ịgwọ ọgwọ okeite na ihe ndị ọzọ iwu na-akwadoghị n’ụlọikpe n’oge na adịghị anya.
Ọzọ bụ n’Agụnaechemba bụ otu nchekwa pụrụiche nke gọọmentị Anambra Steetị hiwere iji kpochapụ ndị omekome nke mere ọrụ nchekwa jiri si ike na steeti ahụ.
Ha awụchịla ọtụtụ ndị dibịa aka ha dị n’ịgwọrọ ndị omekome na ndị chọrọ inwe ego ọsọ ọsọ ọgwụ.
Leave a Reply