Onyeisi Nigerians Diaspora Commission (NiDCOM) bụ Abike Dabiri-Erewa etoola nwa afọ Naịjirịa a na-akpọ Amanda Azubuike bụ nwaanyị Naịjirịa nke mbụ nwetere ọkwa ọchịagha Brigadier General na mba Amerịka.
Abike kọwara ọkwa ọhụrụ Amanda Azubuike dịka ihe na-egosi na mba Naịjirịa na-eme nke ọma n’ụwa niile.
Amanda Azubuike dị afọ iri ise na N’ọnwa Epril, afọ 1989 ka ọ nwetere akwụkwọ ikike ịbụ nwa amaala mba Amerịka.
A mụrụ Amanda Azubuike na London, United Kingdom ebe nna ya bụ onye Igbo mana nne ya bụ onye amaala mba Zimbabwe.
Ọ banyere agha mba Amerịka n’afọ 1994 ka ọ gụchara akwụkwọ na mahadum a na-akpọ University of Ventral Arkansas n’afọ 1993.
Leave a Reply