Onyeisiala Naịjirịa bụ,Bola Tinubu ekeleela John Dramani Mahama nke pati (NDC) na mmeri ya na ntuliaka ọkwa onyeisiala Gana.
Nke a na-abịa dịka osote onyeisiala Gana bụ Mahamudu Bawumia kwuru na ya kpụrụ afọ n’ala na ntuliaka ahụ.
Akwụkwọozi si n’obi ọchịchị Onyeisiala Tinubu kwuru na ọ na-atụ anya na mmekọ dị n’etiti Gana na Naịjirịa ga-aga n’ihu ma nweta udo na mba dị na mpaghara Ecowas.
Onyeisiala Tinubu gara n’ihu kelee ụmụafọ Gana maka etu ha si pụta n’igwe bịa tụọ vootu ha na ntuliaka ahụ.
O kelekwara Muhamadu Bawumia maka ịnabata mpụtara ntuliaka ahụ tupu ụlọọrụ Electoral Commission (EC) kwuputa mpụtara ntuliaka ahụ.
A na-atụ anya mpụtara ntuliaka ahụ n’aka ụlọọrụ EC.
Leave a Reply