Donald Trump ahọpụtara dịka onyeisiala mba Amerịka ekwuola na ọ ga-agbaghara ndị ahụ so mee ngagharịiwe n’ụlọomeiwu mba ha bụ ‘Capitol’ ngwa ngwa o weere oche ọchịchị.
Na mkparịtaụka ya na ụlọọrụ mgbasaozi NBC nwere, Trump kwuru “Ndị a bi n’ọkụ mmụọ.”
O kwuru na ọ ga-agbaghara ndị a mana a ga-eleba anya n’ihe ha mere n’otu n’otu iji mana na ọ ga-eme nke ahụ ngwa ngwa.
Trump ṅụkwara iyi na ọ ga-egbochi atụmatụ ikike mere ụmụaka ndị mbịara mbịa mụrụ na mba Amerịka ịbụ nwafọ ha.
Kama ọ sị na ya na pati Democrat ga-arụkọ ọrụ iji hụụ na e nyeere ụmụaka ndị batara n’Amerịka na-enwehji akwụkwọ aka inwete akwụkwọ.
Trump kwuru na ọ ga-eji ikike o nwere dịka onyeisiala gbanwee iwu a nyere nwata a mụrụ n’Amerịka ịbụ onye mba ahụ.
Iwu a kpọrọ ‘Birthright citizenship’ malitere na mgbanwe iwu mba Amerịka nke ugboro iri na ano – nke kwuru na nwata ọbụla a mụrụ n’Amerịka ga-abụ nwafọ ha na-agbanyeghi na nne na nna ya abụghị ndị Amerịka.
“Anyị ga-ahụ na a gbanwere ya,” ka Trump kwuru. “Anyị nwereike ịga jụọ ndị mmadụ ajụjụ. Mana anyị kwesịrị ịkwụsị ya.”
Trump gakwara n’ihu kwuo na ọ ga-emezu nkwa o kwere n’ịchụpụ ndị mbịara mbịa na-enweghi akwụkwọ zuruoke nke gụnyere ndị ezinaụlọ ha bụ ndị Amerịka.
“Achọghị m ikewa ezinaụlọ,” ka o kwuru, “otu ụzọ m nwereike isi mee ka m ghara ikewa ezinaụlọ bụ site n’ichịkọta ha ọnụ ma chụlaa ha.”
Leave a Reply