Ojije osote onyeisiala gara na mba Sweden bara nnukwu uru makana ụfọdụ ụlọ ọrụ mba ofesi a ekwelarị nnukwu nkwado maka akụ na ụba Naijiria.
Ihe niile onyeisiala na-eme ka obodo a were gaa n’iru okachasi na-ebe onodu aku na uba ga-abu nke ga-abuzi akwaa akwuru maka nkwado a.
Kashim Shettima osote onye isi ala, bụ onye na-aga njem ọrụ ụbọchị abụọ nke ebumnuche iji kwalite azụmahịa na mmekọrịta dị n’etiti Nigeria na Sweden, kwuru na mba abụọ ahụ nwere akụkọ ihe mere eme nke imekọ ihe ọnụ, karịsịa na azụmahịa, nkà na ụzụ, na mmepe na-adịgide adịgide.
Gọọmenti Naijiria, n’okpuru onyeisiala Bola Tinubu, emeela mgbanwe ndị siri ike nke na-emezigharị akụ na ụba mba ahụ maka ọganihu dika osote onyeisiala siri kwuo.
Leave a Reply