Mgbe ikpeazụ e tinyere ya ozi ọhụrụ abali ato Maachị 2024
N’ụbọchị Satọde ka ozi pụtara banyere ọnwụ nwaamadị a ma ama na-eme ihe ejije mkpaọchị. Lee anya ka ị hụ ụfọdụ ihe ndị ị maghị banyere Mr Ibu.
- Ezigbo aha ya bụ John Ikechukwu Okafor (Mr Ibu), ọ bụ nwaafọ Nkanu West nke Steeti Enugwu.
- O nwere ụmụnne mana onye nke a maara nke ọma bụ nwanne ya nwaanyị Queen Chioma Egboh.
- N’oge nna ya nwụsịrị, ọ gara biri na nke nwanne ya nwoke dị na Sapele bụ ebe ọ nọọrọ na-arụ ụmụ irighiri ọrụ iji nyeere onwe ya aka n’agụmaakwụkwọ ya.
- Ọ gara ụlọakwụkwọ College of Education, Yola ma mechaa gbahapụ agụmaakwụkwọ ya n’ihi nsogbu ego. Ka emesịrị, ọ natara ọzụzụ n’ụlọakwụkwọ Institute of Management and Technology, Enugwu.
- Tupu ya abanye n’ịkpa ndị mmadụ obi ụtọ, ọ bụụrụ onye na-alụ ọgụ ‘Shotokan Karate’ dịka o ruru n’ọkwa ‘black belt’ mgbe ọ ka dị naanị afọ 16.
- Ọ bụụrụ onye nhazi ejije bụ ‘producer’ tupu ya amalite ime ihe ejije n’onwe ya.
- O nwere ọmarịcha ụlọ na Steeti Legọs.
- Ọnọdụ ahụike ya bịara dị njọ n’afọ 2022 nke mere ka afọ ya zaa. O boro ebubo n’oge ahụ na otu n’ime ndị ikwu na ibe ya kwụrụ onye ọrụ ya ụgwọ ka o nye ya nsị n’otu mmemme ọ gara. Ka e mesịrị, o nwetara onwe ya n’otu ụlọọgwụ onye nkịtị nwe.
- Afọ iri na ato gara aga Mr Ibu lụrụ nwunye ya nke abụọ bụ Stella-Maris Okafor ma mụta ụmụ atọ nke gụnyere ndị nwoke abụọ bụ Emmanuel na Jay Jay tinyekwara otu nwaanyị bụ Chelsea.
- E wezuga ụmụ ndị nke ahụ Stella mụtara, Mr Ibu nwekwara ụmụ ndị ọzọ nke gụnyere Jasmine Okafor.
- Mr Ibu akpaala ike dị egwu n’ime ihe ejije kemgbe ihe karịrị afọ 20 gara aga dịka o sonyere n’ọtụtụ ihe ejije dị iche iche ndị gụnyere Open and Close, Mr Ibu, Sherikoko, Unbreakable, The Album, Desperate Search, Recharge Card, The Eve, Victim of Love, Honeymoon Guy, dgz.
- Ejije o sonyerela gụnyere ‘Hotel De Jordan’, ‘Agony’, ‘Rolling Stone’, ‘FourFourty’ dgz.
- Okafor bụkwa onye ọtụtụ ụlọ ahịa dịka Glo,Gotv jirila ihu ya ree ahịa
- Ọ nwuru n’abali abuo nke onwa Maachị 2024 dịka o nwechara obi nkụchi bụ ‘Cardiac arrest’.
Gịnị gburu Mr. Ibu?
Mr Ibu na-arịa ọrịa kamgbe afọ 2023
Ọ bụghịzi ihe nzuzo na onye ejije a ma ama bụ John Okafor nke e ji Mr Ibu mara nọ na-arịa ọrịa kamgbe afọ 2023.
Nke bụ eziokwu bụ na ọ gbara ihe niile n’anwụ oge ọ rịọrọ ka ọha nyere ya aka n’ọnwa Oktoba afọ 2023.
Oge ahụ, nwada Jasmine gwara BBC Igbo na; ‘a mabeghi ihe na-arịa nna m’, mana e mechara o kwuo na a wara ya ahụ ihe ruru ugboro ise.
Nke kacha nke bụ na e mechara bee ya otu ụkwụ maka na ọbara ya nọ na-akpụkọ n’akụkụ ahụ ya dị icheiche nke a kpọrọ ‘blood clot’ na Bekee.
Mana ihe kụwaziri akụ oyibo nsugbe ma dọbie ndụ onye ọkpaọchị ahụ bụ na dịka onyeisi otu ndị na-eme ejije na Naịjirịa bụ Actors Guild of Nigeria, AGN bụ Emeka Rollas siri kwuo; “Ibu nwere obi nkoropu mana ọ lọghachiteghi, ọ bụ ihe mwute mana ọ laala”.
Nke a bụ ozi Rollas zipuru iji kwuo na Ibu anwụọla.
BBC Igbo ka na-agba mbọ inweta ezinaụlọ ya mana ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n’okwu eitnyela ọnụ n’ọnwụ dịmkpa ahụ ma kwuo na ihe efularịla ndị Naịjirịa.
Leave a Reply