Onye isi ala Bola Ahmed Tinubu emesighachila ndị Naijiria obi ike na a na-ewu ụlọ nchekwa obodo ugbu a maka nsonaazụ kacha mma a tụrụ anya ya.
N’ozi nke ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala bụ Ajuri Ngelale binyere aka, onyeisiala kwere nkwa na ndị kpara mkpamkpa ogbugbu e gburu ndị eze ọdịnala abụọ na steeti Ekiti bụ Onimojo nke Imojo-Ekiti, Oba Olatunde
Samuel Olusola na Elesun nke Esun-Ekiti, Oba Oba.
David Babatunde Ogunsola, agaghị agbanarị ikpe ziri ezi.
Ka ọ na-akatọ ndị na-enweghị uche na obi ọjọọ na-egbu ọbara na Ekiti, Onyeisiala nyekwara ntụziaka ka a napụta ụmụ akwụkwọ na ndị nkuzi a tọọrọ na gburugburu Eporo-Ekiti nke steeti ahụ.
Leave a Reply