Take a fresh look at your lifestyle.

Willie Obiano awụchiela n’ụlọikpe ịzara ọnụ ya n’ebubo EFCC boro ya

0 226

Willie Obiano chiburu Anambra Steeti awụchiela n’ụlọikpe ịbịa zara ọnụ ya n’ebubo ụlọọrụ na-ebu agha megide mpụ bụ Economic and Financial Crime Commision (EFCC) boro ya.

Ikpe a na-aga n’ihu ugbua n’ụlọikpe ukwu dị n’Abuja dịka ọkaikpe Inyang Ekwo ga-asape akwụkwọ ọnụ ebubo itoolu EFCC boro Obiano nke gbadoro ụkwụ na mpụ na nrụrụaka ego ruru ijeri naịra anọ.

Nkpụpụ Obiano n’ụlọikpe a na-abịa n’ime otu izuụka Onyeisi EFCC bụ Ola Olukoyede ṅụrụ iyi ịbọlite ebubo mpụ metụtara ndị ọchịchị nke a gbahapụrụ kamgbe ọtụtụ afọ ọkachasị ndị bụbu gọvanọ.

Cheta na ụlọọrụ EFCC nwuchiri Obiano n’ọdọụgbọelu dị na Legọs n’ọnwa Maachị 2022 n’ime awa ole ma ole ọ rịturu n’ọkwa gọvanọ mgbe ọ chọrọ ime njem aga mba Amerịka.

EFCC mara ọkwa ịkpụpụ Obiano n’ụlọikpe

Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ EFCC bu Dele Oyewale gwara BBC nke a na mkparituaka ekwenti na ha ga-akpụpụ Obiano n’ụlọikpe n’ụbọchị Wenezde abali iri abuo na ano nke onwa Jenụwarị 2024.

Oyewale kwuru na ha na-akpupu n’ihu Ọkaikpe Inyang Ekwo nke ụlọikpe ukwu dị n’Abuja n’ebubo itoolu banyere izu ego ruru ijeri naira ano (N4bn).

N’okwu ya, “o bu eziokwu, anyi ga-akpupu ya uloikpe maka mpu ruru N4bn”.

Ufodu ebubo ndi e ji akpupu Obiano uloikpe

Onye nkwuchiteonu EFCC bu Dele Oyewale gwara BBC Igbo na ebubo e ji akpupu Obiano uloikpe bu ebubo itoolu. Nke a gunyere

  • O si n’ime ego ‘Security vootu’ nke Anambra steeti ma site n’aka onye oru ya aha ya bu maazi Willie Nwokoye were ego ruru N156,800 zigara C.I Patty Ventures Nigeria Limited bu onye ya na goomenti Anambara na-enweghi mmekorita obula oge ahu
  • O si n’ego “security vootu’ Anambra Steeti site n’aka onyeoru ya maazi Willie Nwokoye zipu ego ruru N261,268,585.00 gaa Easy Duamond Integrated Link nke ha Anambra steeti na-enweghi mmekorita obula.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *