Take a fresh look at your lifestyle.

Kedu ihe ga-eme ego ndị mmadu n’ụlọakụ Polaris, Keystone, na Union?

0 269

Ụlọakụ etiti nke Naijiria (CBN) chụrụ ndị bọọdụ ụlọakụ Keystone, Polaris na Union maka na ha anaghị agbaso ụkpụrụ nakwa ịwụ ụlọ akụ nke etịtị, nakwa ọdịda ọchịchị na ụlọ ọrụ ha.

CBN weputara ndị ọhuru ga e were oche ịlekọta ụlọaku atọ ahụ.

Nchọpụta Jim Obazee mere nakwu ndụmọdụ ọ nyere mere CBN jịrị mee ịhe ha mere.

Obazee bụ onye nyọcha dị ịche nke ọnye ịsịala Naịjịrịa, Bola Tinubu nyere ịkịke ka o nyọchaa ndị CBN nakwa azụmahịa ndị gọọmentị etịtị.

Nyọcha ahụ nwetere ngbawe dị ịche ịche na ụlọaku dị na Naijịrịa nke ndị CBN na ahu maka ya.

Obazee ka enyere ọrụ ịyọcha ka ndị ụlọakụ nakwa ndị nkịtị si emefu egọ gọọmentị.

Ọrụ ahụ dịna akwụkwọ ọnyeisiala Naịjịrịa Bola Tinubu nyere ya ịjị bị dọ nyọchaa.

Ọ gịnị ga eme ego ndị mmadu dị na ụlọakụ Union, Keystone na Polaris

Na nkeke, ọnweghị ịhe ga eme egọ ha. Ọ dịghị ihe a na-atụ anya na ọ ga-agbanwe maka ndị nwere ego n’ụlọ akụ ahu.

Maka na ndị ụlọakụ ekwughị na ha agaghị akwụ ụgwọ.

CBN weputara nkwupụta n’abali iri abuo na asaa nke onwa Disemba iji gosi nke a, na-adụ ndị mmadu ọdụ “ka ha gaa n’ihu na azụmahịa ụlọ akụ ha dị ka ọ na-adị, n’ihi na ọ dịghị ihe mebịrị” ka o kwuru.

“Anyị na-agwa ọha na eze na ndị na-edebe ego maka nchekwa na ụlọakụ na onweghị ịhe ga eme ego ha.”

Ọ dị mma icheta na nke a abụghị mbụ CBN chụrụ n’ọrụ ma họpụta ndị nlekọta ọhụrụ n’ụlọakụ ndị mmadụ na Naịjirịa. N’oge gara aga, dị ka ụlọau Skye na 2018, enweghị ndị ego ha furu.

Kedu maka ahịa ego?

Ụlọakụ ndị ahụ anọghị na ahịa ego, nke a mere na onweghị ịhe ga eme ego ndị mmadu maka mgbawe ndị ịsị dụlọakụ atọ ahụ.

Union Bank, nke na-arụ ọrụ na Nịjerịia ihe karịrị narị afọ ka ewepụrụ na ahịa egọ na mgbe na-adịbeghị anya – ya mere ọ naghị azụ ahịa na Mgbawe ego nke Naijiria ke – mgbe Titan Trust Bank zuru ha na afọ 2022.

Yabụ kedu ihe kpatara CBN ji etinye aka mee mgbanwe na ụlọaku?

Okwu dị n’ụlọ akụ atọ ahụ sitere na emeghị iwu gbasara ego, ọdịda ọchịchị ụlọ ọrụ, ileghara ọnọdụ ndị enyere ikike ikike itinye aka n’ihe omume ndị na-eyi egwu nkwụsi ike ego, na nsogbu ndị ọzọ.

Mazị Obazee kọwapụtakwara na akụkọ gbasara e tu ụlọakụ Titan Trust sịrị zuta ụlọaku Union nakwa nkwekọrịta Keystone na ndị ọzọ mere. Ụlọakụ Union ka erere mgbe Gọdwin Emefiele bu onye ịsị ụlọaku nke ọnye ịsị ala Boola Tinubu churu achu maka mpu na awụwọ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *