Take a fresh look at your lifestyle.

Etu Asompi bọọlụ mbụ Naịjirịa n’asọmpi AFCON 2024 siri gaa

0 293

Asọmpi AFCON 2024 a na-agba na mba Ivory Coast bidoro ụnyaahụ bụ abali iri na atọ nke onwa Jenụwarị 2024.

Naịjirịa na Equitorial Guinea gbara bọọlụ nke mbụ ha unyaa bụ abali iri na anọ nke onwa Jenụwarị.

Nke a bụ ugboro iri abụọ Naịjirịa na-agba bọọlụ n’asọmpi AFCON bụrụkwa nke ugboro anọ nyere ndị Equatorial Guinea.

Equitorial Guinea buuru ụzọ nye Naịjirịa ọkpụ goolu na mbido egwuruewu ahụ. O teghị aka, Victor Osimhen asataara Naịjirịa ya bụ goolu nke meere ya otu ọkpụ otu ọkpụ.

Mara na asọmpị Afcon nke 2024 bidoro n’abali iri na atọ nke onwa Jenụwarị afọ 2024.

A ga-agbacha asọmpi a n’ubọchị iri na otu nke onwa Febrụwarị 2024, ubọchị ahụ ka aga-ama mba ga-amaburu iko mba Afrịka.

AFCON bidoro n’afọ 1957 na Sudan.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *