Take a fresh look at your lifestyle.

Ọrịa ndị oke okpomuoku na-ebute na etu ị ga-esi chekwa onwe gị

0 367

Mana ọ dị zi ka ọkọchị nke ugbua a ka njọ dịka igwe na-ezi ozi maka ihu igwe bụ Google weather si gosi.

O dobeghi anya ihe kpatara nke a dịka ụfọdụ na-atụ aka na mgbanwe ihu igwe dịka ihe butere ya.

N’agbanyeghị nke a, ngalaba ahụike mbaụwa niile bụ WHO n’ịchafụ ekwuola ihe ndị ị ga-eme iji gbalahụ ọrịa maọbụ mmerụ ahụ n’oke “heat”

Lee ha ebe a:

– Gaa n’akụkụ kacha ju oyi n’ụlọ gị

– Nọrọ n’ime ụlọ mgbe ụbọchị kacha dị ọkụ

– E mena ihe ga-emekpa gị ahụ dịka ịgba ọsọ, ị chọọ ime nke a, mee ya n’ụzụ ụtụtụ tupu anwụ achawa.

– Gbaa mbọ nọrọ na ndo ma ị pụọ n’ezi.

– Ahapụna ụmụaka maọbụ ụmụ anụmanụ n’ime ụgbọala kwụ akwụ.

-Ṅụọ mmiri mgbe niile ma gbahapụ mmanya ndị nwere oke suga na mmanya ike.

– Saa ahụ gị ihe ruru ugboro atọ kwa ụbọchị.

– Yiri uwe agaghị ekekpa gị ahụ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *