Take a fresh look at your lifestyle.

O pekata mpe mmadụ otu nari anwụola n’idemmiri na Congo DRC

0 371

Idemmiri eriela isi mmadụ karịrị otu nari na mba Kongo díka ọdọmmiri mba ahụ etoola karịa ka ọ si dị kemgbe afọ iri na ise gara aga.

Ndị ọnụ na-eru n’okwu kwuru na ewubeghị ụlọ etu kwesịrị ekwesị nakwa arụghị okporoụzọ nke ọma so n’ihe mere ọtụtụ mba Afrịka ji enwe nsogbu oke ide mmiri ma e nwee nnukwu mmiri ozuzo.

Ọkammụta n’ihe gbasara mmiri na mgbanwe eluigwe bụ Ferry Mowa kwuru na ụlọoru ya etibuola mkpụ banyere ọdọmmiri ahụ n’ọnwa Disemba gara aga.

N’ụbọchị Wenezde, mmiri ahụ ji mita 6.20 (20.34 feet) karịa oke osimiri nke fọrọ obere ihe ka o ruo n’ogo ihe mberede ọdọmmiri nke 1961, bụ mita 6.26, nke ahụ ka ọ gwara ụlọọrụ mgbasaozi.

N’okwu ya, ”ọ dị oke mkpa na ndị bi n’okirikiri mmiri ga-akwapụ”

O kwuru n’otu ozi o zipụrụ sị,”Ọtụtụ mmadụ anwụola maka ihe mberede a, ihe ruru mmadụ 300 anwụọla, ezinaụlọ 300,000 bụ ndị ọ metụtara, ebe puku ụlọ mebiri.”

N’otu aka ahụ, ndị ọnụ na-eru n’okwu gwara ụlọntakụkọ ‘Reuters’ na opekata mpe, mmadụ iri na asaa anwụọla gburugburu Kongo Rịpụblik maka ya bu ihe ọdachi.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *