Take a fresh look at your lifestyle.

Victor Bonniface agaghị eso n’egwu AFCON

0 270

Ọgbaa bọọlụ Bayer Leverkusen bụ Victor Boniface esorola n’ahịrị ndị agaghị agbara Naịjirịa bọọlụ n’asọmpị AFCON na-abịa.

Nke a mere dịka Boniface merụrụ ahụ mgbe o so otu Super Eagles gaa ọzụzụ nkwado asọmpị a na Abu Dhabi.

Nke a ga-eme ya mmadụ nke anọ dapụrụ n’ịgbara otu a bọọlụ na ya bụ asọmpị site n’imerụ ahụ; ndị ọzọ bụ Wilfred Ndidi nakwa Taiwo Awoniyi.

Cheta na Naịjirịa ga-amalite njem ibulata iko mba Afrịka n’ụbọchị 14 nke ọnwa Jenụwarị dịka ha ga-ezute Cote d’Ivoire nakwa Guinea Bissau

                                         

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *