Take a fresh look at your lifestyle.

Ụlọikpe achụọla osote onyeisi ụlọomeiwu Bauchi

0 222

Ụlọikpe mkpegharị n’Abuja achụpụla oso onyeisi ụlọomeiwu Bausti Steeti bụ Jamilu Barade ma nye iwu ka e megharịa ntuliaka ụfọdụ ebe na steeti ahụ.

Nke a na-abịa naanị abalị ka ụlọomeiwu chụpụkwara onyeisi ụlọomeiwu steeti ahụ bụ Abubakar Suleiman na-anọchite mpghara Ningi n’okpuru ọchịchị Ningi na steeti ahụ.

Ụlọikpe ahụ kachapụrụ ikpe ụlọikpe ntuliaka nke Bauchi steeti meburu ebe e kpebiri na Barade onye PDP meriri ntuliaka ahụ ma bụrụ onye kwesiri ịnọchite mpaghara bauchi Sentraalụ n’ụlọomeiwu ahụ.

Jamilu Barade FacebookCopyright: Jamilu Barade Facebook

Jamilu Barade n’ụlọomeiwuImage caption: Jamilu Barade n’ụlọomeiwu

Cheta na onye zọrọ oche ahụ na pati All Progressive’s Congress APC bụ Aliyu Ilela gbara akwụkwọ n’ụlọikpe megide mpụtara ntuliaka ahụ ma kwuo na e a tụkarịrị vootu n’ogbe vootu itoolu, mana ụlọikpe kagburu mkpesa ya.

Ọ nabatakwaghị mkpebi a ma buru ya gaa n’ụlọikpe mkpegharị ebe e kpebiri ya nye ya bụ onye APC mmeri ugbua,

Ụlọikpe nyere iwu ka ụlọọrụ Independent National Electoral Commission bụ Inec napụta Barade asambodo nyere ya ọkwa e nyere ya ma megharịa ntuliaka n’ebe e nwere nsogbu ahụ ka a mata onye meriri n’ezie.

Etu ọ dị ugbua, Inec na Bauchi gwara ndị ntaakụkọ na ha anatabeghi akwụkwọ si n’ụlọikpe mana ha dị njikere imegharị ntuliaka ahụ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *