Take a fresh look at your lifestyle.

Ihu ọchị awaala ndị Enugwu dịka mmiri malitere ịgba ọzọ

0 209

Ndị Enugwu nna-enwe ọṅụ, achị eze dịka mmiri malitere gbawa ọzọ n’ọtụtụ ebe dịka Gọvanọ Peter Mbah si kwee na nkwa.

Mbah kwere nkwa dịka a na-edu ya n’iyiọrụ dịka Gọvanọ Eniigwu steeti na mmiri ga-amalite ịgba n’ime mkpụrụ ụbọchị 180 ọ banyere ọchịchị.

N’ụbọchị Satode, abalị iri abuo na ise nke ọnwa Novemba, afọ 2023 Mbah mere emume ịgbape mmiri na 9th mile dị n’Enugwu ma kwuo na mmiri ahụ adịla onye ọbụla bi n’ime isi obodo Enugwi nso.

Oge ndi nta akuko gagharịrị na gburugburu Enugwu iji chọpụta na mmiri ọ na-agbazi n’ezie, ọ hụrụ Edinburgh Junction na Bilante dị na GRA Enugwu pọmpụ mmiri ahụ na-agba nke ọma, ebe ndị bi na gburugburu ahụ na-echuzi mmiri etu o siri masị ha.

Ebe ndị ọzọ mmiri na agbakwa gunyere; Artisan, Asata, Transekulu, Abakpa, Emene nakwa ebe ndị ọzọ.

Ụfọdụ ndị Enugwu na-echu mmiri kwuru na obi dị ha nnukwu aṅụrị na gọọmenti nọ ugbua mezuru nkwa ha kwere.

Otu n’ime ha gara n’ihu rịọkwara Mbah ka ọ ghara ịkwụ ime ihe ọma ma o nweta ohere ịzọ agba nke abụọ ya.

“Obi dị m ụtọ ka m hụrụ mmiri a. Peter Mbah bụ Gọvanọ anyị egosila na mbata ọ batara n’ọchịchị,anyị agaghị anọ n’ụkọ mmiri n’afọ.

“Ọ bụghị o mee nke a maramara, o rụe n’agba nke abụọ ya, ọ pịawa anyị ụttarị.”

Gọvanọ Peter Mbah kwere nkwa na ya ga-arunyekwa otụtụ ebe ọzọ a ga na-echu mmiri ma kwue na ebumnobi ya bụ na oge na adighị anya mmiri ga na-agba n’ime ụlọ ndị mmadụ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *