Take a fresh look at your lifestyle.

‘Anyị nwere ike ikpochapụ alụmdi ụmụaka n’ọgbọ a’

0 191

Onye ọkaiwu na onye mgbasaozi bụ Michelle Obama,onye ọkaiwu na-agba mbọ maka ikike dịịrị onye bụ Amal Clooney na onye ọrụ ebere bụ Melinda Gates mara ọkwa afọ gara aga sị na ha ga-ejikọ aka ọnụ luso nsogbu ílú di na-erughí eru ọgụ.

Mana dịka ihe sịrị kwụrụ ugbua, otu mbaụwa bu ‘United Nations’ kwuru ọ ga ahịa ahụ ịkwụsị ịmanyị ụmụaka lụọ di rue narị afọ atọ na-abịa.

Mana Oriakụ Obama gwara nta akuko sị: “Ọ bụ ihe e nwere ike kwụsị echi.”

Ụmụnwaanyị atọ a gwara ndi ntaakuko otu nari 100 Women okwu na mkparịtaụka mgbe ha gara nleta na Malawi na Saụt Afrịka.

Lucy di afọ Ịrị Abụọ na ịsịi ebechaala akwa ngbe ọna akọwa ọnodu ya Lucy nọ na Ọba akwụkwo dị na Ludzi Girls Secondary School na ọbọdọ etịtị Malawị. Ndị ọrụ nzuzo US guzoro n’èzí, n’okpuru ire ọkụ na-acha uhie uhie osisi nke ogige ụlọ akwụkwọ. Ọ ka nọ na-ekwu maka mkpa ọ dị ụmụ agbọghọ ịnọ n’ụlọ akwụkwọ ma wepu uche na alụmdi na nwunye ọkacha ịnụ ndị okenye, tupu ọwe ihe mmetụta nwere bewe akwa.

 

Mgbe Lucy na ekwu ọkwụ, Ụmu nwayị atọ ọrụ mmadụ kacha emetụta na mba ụwa –

Melinda French Gates, Amal Clooney na Michelle Obama – nwere nwayọ na-ege akuko ya.

Dị ka NGO Girls Not Brides si kwuo, Malawi nwere otu n’ime ụmụaka kachasị elu

Ọnụ ọgụgụ alụmdi na nwunye na Eastern na South Africa, na 42% nke ụmụ agbọghọ ugbua

lụrụ di tupu ha eruo afọ iri na asatọ. Na mpaghara Mchinji, ebe ụlọ akwụkwọ ụmụ nwanyị Ludzi dị, ekwuru na 33% ụmụ agbọghọ ha na-atụrụ ime tupu ha eruo 18, nke mere ha gịrị ahapụ agụmakwụkwọ.

 

Lucy nwere ike ịbụ otu n’ime ụmụ agbọghọ ahụ. Nna ya chọrọ ka ọ pụọ

ụlọ akwụkwọ mgbe ọ dị afọ Ịrị na Anọ, mana ọ jụrụ, ma mesịa ghọọ nwa agbọghọ mbụ gara

mahadum na obodo ha. Ugbu a, o nwetara akara ugo mmụta na agụmakwụkwọ, ọ bụ

Onye ndu otu akpọrọ AGE Africa, otu nzukọ na-enye aka eme ka

ụmụ agbọghọ na-adịghị ike na Malawi gaa akwụkị̀ọ ne efụ (Scholarship), obodo ebe agụmakwụkwọ sekọndrị na-enweghị n’efu. Lucy bụbu nwata akwụkwọ, mana ugbu a ọ na-enyere ụmụ agbọghọ aka na onwe ya.

Nne ya nwere obi ụtọ dị ukwuu maka ihe ọ rụzuru, Lucy kwuru, n’agbanyeghị na nna ya ka na- ewe ịwe maka ya.

Ọ sị na nna ya ka na-eche ọtụ ya sịrị kwụrụ chịmchịm ka nwada.

Michelle Obama bụbụ isi nwaanyị mba Amerịka nọ n’aka ekpe Lucy kwuru sị, “Ị ga -izite nna gi ozi?

“Oge ọzọ ị ga-ahụ ya, gwa ya na ọbị dị Michelle na Barack Obama ụtọ ebe ị nọ, okacha ụdịrị nwanyị ị bu ugbua.”

Lucy leliri anya elu n’ọnụ ọchị. N’aka nri Lucy bu ọnye ọkaịwụ mba ụwa.

Ọkaiwu Clooney; “Gwa ya na i nwekwara onye ọkaiwu ugbua”.

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *