A tọhapụla ndị Izrel ọzọ ndị Hamas jibu eji n’ụbọchị Satode ka e gbuchara oge awa ole na ole nke mere obi mmapụ jide nsị ezinaụlọ ha.
Ndịagha Izrel kwuru na a tọhapụrụ ụmụafọ ha iri na ato. ebe ha tọhapụrụ ndị Palestine iri ato na itolu na West Bank.
Hamas tọhapụkwata ndị Thailand anọ.
Ntọhapụ mbụ e mere ụbọchị Fraide nke so nkwekọrịta ịkwụsịtụ ọgụ abalị anọ nke Qatar haziri n’etiti mba abụọ ahụ gara nke ọma.
Nkata ntụmadị e nwere bụ ihe mere ka ntọhapụ nke e mere na Satode nwee isi.
A tụpuru anya na Israelis ga-enyefe otu Red Cross nọ n’agbata Gaza na Ijipt n’Elekere anọ(14:00 GMT).
Alaka ọgụ otu Hamas bụ Qassam Brigades, kwuru na e nwere nsogbu ibubata ngwa enyemaka n’ụgwu Gaza.
Ọnọdụ e kwuru a ga-eji eji ndị Hamas nwuchiri agbanwe ndị Palestine nọ na mkpọrọ.
Israel gọrọ si na ha emebighị ọnọdụ nkwekọrịta ha..
Leave a Reply