Take a fresh look at your lifestyle.

Diri ekelela ndị Bayelsa maka mmeri ya

0 222

Aka na-achị Bayelsa Steeti bụ Douye Diri ekelela Chineke na ndị Bayelsa maka mmeri ya na ntuliaka ọkwa Gọvanọ Bayelsa Steeti e mere n’abalị iri na otu nke ọnwa Novemba afọ 2023.

Diri Nke PDP ji vootu dị 175196 merie Timipre Sylva nke APC, onye nwetara vootu dị 110108, ebe Udengs Eradiri nke Labour Party nwetara vootu dị 905.

N’ozi nke Diri o wepụtara n’akara ọbaọzi ya n’X, ọ sịrị,”Ndị Abịa, ekele m ụnụ.”

Ọ gara n’ihu kwuo sị, Mmeri a a bụ site n’ike nke Chukwu nakwa nkwado ụnụ nyere m iji gbara ụnụ odibo afọ anọ abụọ.”

” Aga m aga n’ihu n’ịbụ gọvanọ mmadụ nile.”

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *