Take a fresh look at your lifestyle.

Ndị agha nọ n’ọchịchị na mba Niger gbochiri Mohammed Bazoum ịgbapụ ọsọ.

CHIGO.

0 390

Ndị agha nọ n’ọchịchị na mba Niger ekwuola na onye bụbu onyeisiala mba ahụ bụ Mohammed Bazoum na ezinaụlọ ya na ndị ọrụ ya nwara ịgbapụ ọsọ n’etiti abalị

Ha kwuru na ndị ahụ nwara ịji ụgbọelu helikọpta gbapụ mana akwụsịrị ha.

Cheta na anwụchiri Bazoum n’ime ụlọ ya kemgbe ọnwa Jụlaị mgbe anapụrụ ya ọchịchị n’ike.

Ọnụ na-ekwuru ndị agha ahụ nọ n’ọchịchị bụ Amadou Abdramane kwuru na ọ bụ ebe elekere atọ nke ụzụ ụtụtụ ka ha nwara ịgbapụ ọsọ ahụ.

“Anyị nwụchiri ndị kpara nkata a nakwa ndị ọzọ so ha mee nke a mgbe ihe ha nwara kụrụ afọ n’ala” ka o kwuru n’igwe onyonyo na mba ahụ.

O kwuru na atụmatụ mgbapụ ha gụnyere isi ebe e ji ha gbalaga ebe ọzọ ma banye ụgbọelu helikọpta fega n’akụkụ Naịjirịa.

Amaghị ebe e jizi onye bụbu onyeisiala ahụ nakwa ndị ọzọ ugbua mana amalitela nyocha banyere ihe mere.

Mohammed Bazoum ajụla itinye akwụkwọ arụkwaghịm kemgbe anapụrụ ya ọchịchị n’ike n’ọnwa Julai.

BBC IGBO

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *