Otu n’ahụ maka Ihe ndị ruuru mmadụ kwuru na Israel tụrụ bọmbụ Phosphorus nke ọcha na Gaza.
LANTANA NASIR DERE YA NA BEKEE.
Otu n’ahụ maka Ihe ndị ruuru mmadụ kwuru na Israel tụrụ bọmbụ Phosphorus nke ọcha na Gaza.
Ha boro Israel ebubo na ọ na-eji bọmbụ ọcha phosphorus na-arụ ọrụ agha ya na Gaza na Lebanon, na-ekwu na iji ngwá agha dị otú ahụ na-etinye ndị nkịtị n’ihe ize ndụ nke mmerụ ahụ dị njọ na ogologo oge.
Ndị agha Israel kwuru na “ugbu a amabeghị maka iji ngwa agha di otu na Gaza.Ha e nyeghị nkọwa gbasara ebubo a .
Israel nọ na-atụ bọmbụ na Gaza maka mmegwara na mwakpo Hamas wakporo ndịda Israel.
Isreal e gbuola ndị Palestine 1,500 .
Otu n’ahụ maka Ihe ndị ruuru mmadụ kwuru na ọ kwadoro vidiyo ndị e mere na Lebanon na Octoba 10 na Gaza na October 11 na-egosi “ọtụtụ ikuku na-acha ọcha e kwenyere na o bu bọmbụ Phosphorus nke ọcha.
TV ndị Palestine agbasala vidiyo n’ụbọchị ndị na-adịbeghị anya na-egosi obere anwụrụ ọkụ na-ekpuchi mbara igwe na Gaza nke ha kwuru na ọ bụ ngwa agha dị otú ahụ kpatara.
Ndị agha Israel n’afọ 2013 kwuru na ha na-ewepụ ihe mgbochi ọcha nke phosphorus smokescreen ejiri mee ihe n’oge mwakpo 2008-2009 na Gaza, bụ nke wetara ebubo mpụ agha sitere n’aka òtù ikike dị iche iche.
A na-ahụta phosphorus ọcha dị ka ngwa ọgụ na-ere ọkụ n’okpuru ma dikwa njo nke ukwu .
Leave a Reply