Onye na-ahụ maka nri na-edozi ahụ na-agwa ụmụ nwanyị dị ime mkpa ọ di iri nri dị mma.
CHIGO denwere ya n'Igbo.
Onye na-ahụ maka nri na-edozi ahụ na-agwa ụmụ nwanyị dị ime mkpa ọ di iri nri dị mma.
Onye ndụmọdụ na-ahụ maka nri na-edozi ahụ ,Oriakụ Shereee Ijewere agwala ndị Naijiria, ọkachasị ndị inyom dị ime ka ha bute ụzọ iri nri na-edozi ahụ nke iji gbochie ụmụ ha ibute ọrịa na-adịghị ala ala. O kwuru nke a na Tọzdee, na Mgbakọ Mba Nile nke ndi n’ahu maka mmeputa ogwu na Naijiria mere na Lagos.
Ọ dụrụ ndị nne dị ime ọdụ ka ha rie nri kwesịrị ekwesị iji belata ohere ha nwere ịmụ ụmụaka nwere ọrịa na-adịghị ala ala dịka ọrịa shuga na ọrịa obi, na ndị ọzọ.
Onye bụkwa onye guzobere Carib Health Limited, kọwara na ụfọdụ ọrịa na-adịghị ala ala na ụmụaka nwere ike ịmalite n’afọ, tupu a mụọ ya.
E righi nri di mma nwere ike imegide ahụike nke nwatakịrị n’ọdịnihu.
Leave a Reply