Take a fresh look at your lifestyle.

 Nhụsianya ụgbọ mmiri: Ọkà Okwu Abbas na-eru uju ndị ihe metụtara.

Gloria Essien, Abuja dere ya na bekee.

0 244

Nhụsianya ụgbọ mmiri: Ọkà Okwu Abbas na-eru uju ndị ihe metụtara.

Onyeisi ụlọ omebe iwu, Abbas Tajudeen ekwupụtala mwute maka ihe mberede ụgbọ mmiri mere na nso nso a, nke  gburu ọtụtụ iri mmadụ.

O mere na steeti Adamawa na Niger, Onye isi okwu kpọkuru maka mbọ niile nke gọọmentị na ndị ọrụ ụgbọ mmiri maka ichekwa ndụ ka o buru ka gana adi ire oge niile.

N’abalị Fraịde, a kọrọ na ọtụtụ mmadụ nwụrụ ka ụgbọ mmiri kpuru n’ọdọ mmiri Njuwa, obodo Rugange na mpaghara ọchịchị Yola South nke  steeti Adamawa.

Ka ụbọchị ụka gasịrị, ụgbọ mmiri nke ndị njem karịrị 100 banyere na Mokwa LGA nke steeti  Niger  kpuru, gbuo mmadụ iri atọ n’ime ndị njem ahụ.

Ọzọ na Mọnde, a kọrọ na ihe mberede ụgbọ mmiri mere na Kwatan Mallam Adamu,  obodo Gurin  na mpaghara ọchịchị Fufore nke  steeti Adamawa  gburu ihe karịrị mmadụ iri.

Ọkà okwu ahụ katọrọ ọnọdụ ebe njem mmiri, bu nke nochitere anya   okporo ụzọ na ụgbọ okporo ígwè  dizi njo ugbu a.

Ọkà okwu Abbas ya mere, gwara ndị ọchịchị dị mkpa ka ha tụlee nyocha usoro nchekwa niile nke ma ndị ọrụ ụgbọ mmiri na ndị njem.

Onye na-ekwu okwu, mgbe ọ na-ekpe ekpere maka izu ike nke mkpụrụ obi ndị ahụ furu efu,  kasiri ezinaụlọ ndị ihe metụtara, ndị mmadụ, na gọọmentị steeti Niger na Adamawa  obi maka ihe ọjọọ ahụ.

 

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *