Take a fresh look at your lifestyle.

Ide mmiri na-emebi ihe na Hong Kong ugbua.

chigo .

0 1,457

Ide mmiri na-emebi ihe na Hong Kong ugbua.

Agbachiela ụlọakwụkwọ nakwa ụlọọrụ na Hong Kong dịka mmiri ozuzo ka njọ kemgbe afọ 140 na-ezo n’ebe ahụ.

Nke a ebutela ide mmiri mere ka ebuga ihe karịrị mmadụ otu narị ma buga ha ụlọogwụ nakwa nzọpụta ọtụtụ ndị ọzọ tọrọ n’ebe dị icheiche.

Mmiri a na-ezo kemgbe abalị ụbọchị Tọzde emeela ka okporoụzọ ndị dị n’ebe ahụ na-ekwo ekwo ka nnukwu mmiri.

Ihe onyonyo si na soshal midia pụta gosiri ebe ndị mmadụ na-arị n’elu ụgbọala iji chekwa onwe ha dịka mmiri ahụ na-arịso elu ike.

Ndị isi obodo n’ebe ahụ adọọla aka na ntị na mmiri a na-ezo nwereike ịga n’ihu rue ụbọchị Satode.

BBC,IGBO

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *