Take a fresh look at your lifestyle.

Ụlọ ọrụ meteorology nke steeti Katsina na-azụ ụmụ akwụkwọ iri itoolu .

chigo dere ya n'Igbo.

0 478

Ụlọ ọrụ meteorology nke steeti Katsina na-azụ ụmụ akwụkwọ iri itoolu .

Dr. Muktar Abubakar-Balarabe, onye njikwa, Muhammadu Buhari Meteorological Institute of Science and Technology,steeti Katsina , kwuru na ụlọ akwụkwọ a  e nwela ụmụakwụkwọ mbụ ya dị narị itoolu. Abubakar- Balarabe kwupụtara nke a na Katsina steeti.

Dị ka ya si kwuo, Ụlọ Akwụkwọ, nke e guzobere na 2017, na-enye akara ugo mmụta nke mba na Meteorology na na Climate Change Science.

“Anyị na-azụkwa ndị ọrụ nke Nigerian Meteorological Institute (NIMET) na-arụ ọrụ na ndị chọrọ ịrụ ọrụ na ụlọ ọrụ ihu igwe  n’akụkụ ọ bụla nke ụwa.

“Nke a bụ naanị ụlọ akwụkwọ nke ụdị ya na mpaghara Afrịka dum nke na-azụ ụmụ akwụkwọ na ndị mmadụ dịka World Meteorological Organisation (WMO), amụma iji kwekọọ n’ụkpụrụ UN”.

O kwuru na ewezuga ọzụzụ, ụlọ ọrụ ahụ bụ “Climate Resource Centre” ebe ndị na-eme ihe na mba Africa niile gbakọtara iji kparịta ihe gbasara mgbanwe ihu igwe na-emetụta Africa na ụwa dum.

NAN

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *