Take a fresh look at your lifestyle.

Blue Economy’ na Naịjirịa.

CHIGO DERE YA.

0 242

Nke a bụ nke mbụ a ga-enwe mịnịsta ‘Blue Economy’ na Naịjirịa, nke kpatara ọtụtụ ji ajụ sị, gịnị bụ Blue Economy? Gịnịkwa ga-abụ ọrụ Mịnịsta ga-elekọta ngalaba a?

BLUE ECONOMY bụ okwu e ji akọwa ihe niile gbasara oke osimiri, akụnụba e nwereike inweta na ya, nakwa etu a ga-esi kwalite ma chekwaa gburugburu osimiri.

Nnyocha nke otu Commonwealth mere gosiri na ngalaba a bụ Blue Economy na-ewebata akụ ruru otu tarị dọla na ọkara ($1.5 trillion) kwa afọ, dịka a na-atụ anya na ọ ga-eru tarị dọla atọ ($3trillion) n’afọ 2030.

Gboyega Oyetola, bụbu gọvanọ Osun Steeti, bụ onye onyeisiala Tinubu họpụtara dịka Mịnịsta ga-elekọta ngalaba a, nke a mere ya onye mbụ na Naịjirịa ga-eji ọkwa Mịnịsta Blue Economy.

Gịnị ga-abụ ọrụ Mịnịsta ‘Blue Economy’

Ichepụta etu a ga-esi kepụta ọrụ na ngalaba a, maka imirikiti ndị ntorobịa Naịjirịa na-enweghị ọrụ

Ilebanye n’uzoro mbubata na mbupu ngwaahịa site n’oshimiri, nke bekeee na-akpọ Shipping, ma mee ka ọ kawanye mma

Itinye anya n’ụzọ a ga-esi buso mgbanwe ihu eluigwe (climate change) agha, ma gbochie ụfọdụ ọdachi na-esi n’osimiri

Iwultite ihu osimiri dị icheiche e nwere na Naịjirịa iji Ịkwalite njem nlere anya

Ịkwalite mmekọrịta Naịjirịa na mba ndị ọzọ n’ihe gbasara ọdịmma osimiri.

BBC IGBO

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *