Take a fresh look at your lifestyle.

Vladimir Putin ezigarala ezinaụlọ ndị nwụrụ na ihe mberede ụgbọelu ozi.

chigo.

0 312

 

Onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladimir Putin ezigarala ezinaụlọ ndị nwụrụ na ihe mberede ụgbọelu mere ụbọchị Wenezde ozi iti aka n’obi.

Akụkọ kwuru na Yevgeny Prigozhin bụ onyeisi ndịagha ọlụọ-ọla a kpọrọ ‘Wagner Group’ sọ na ndị nọ n’ụgbọelu.

N’ozi ya ụbọchị Tọzde, Putin sịrị, “Banyere ụgbọelu kpọkasịrị, na mbụ a na m ezigara ezinaụlọ ndị nwụrụ na ya ozi iti aka n’obi.”

” Ọ bụ nnukwu ọdachi.”

“Ozi mbụ e nwetara na-ekwu na ndị ọrụ ụlọọrụ Wagner so na ndị nọ n’ụgbọelu ahụ, ndị a bụ ndị nyere aka n’ụzọ pụrụ iche n’agha anyị na-ebu na Yukren.”

” Anyị ma ma cheta nke a, anyị agaghị echefu ya.”

Ndị ọ dị n’aka kwuru na mmadụ iri nọ n’ụgbọelu ahụ kpọkasịrị na nso Moscow nwụrụ.

bbc igbo

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *