Take a fresh look at your lifestyle.

APGA na-achọ ka  steeti  hibe nchekwa nke onwe ha.

chigo dere ya n'igbo.

0 249

APGA na-achọ ka  steeti  hibe nchekwa nke onwe ha.

Onye isi oche otu All Progressives Grand Alliance (APGA), Maazị Sly Ezeokenwa akpọọla oku ka e lebakwuo anya n’iwu  iji mee ka ndị gọvanọ steeti nwee ike ịchịkwa nchekwa n’ ime nke ngalaba ha.

Ezeokenwa, onye kwuru nke a n’Awka n’ụbọchị Mọnde, tụrụ aro na ihe a ga-eme ka nsogbu maka  nchekwa dị n’akụkụ ụfọdụ nke obodo ahụ, ọkachasị na ndịda ọwụwa anyanwụ.

O kwuru na ndị gọvanọ maara nke ọma ngalaba ha na ihe dị iche iche ha mana ha na-akwa mmakwaara na n’agbanyeghị na ha bụ ndị isi ọrụ nchekwa na steeti ha, na ha enweghị ikike na igwe nchekwa.

“Anyị chọrọ nyocha nke ọma n’usoro iwu ga-eme ka ọchịchị gọọmenti etiti bụrụ eziokwu. Usoro iwu dị adị bụ ihe kpatara ọtụtụ nsogbu anyị.

“Ụzọ kachasị mfe iji dozie nchekwa ndịda ọwụwa anyanwụ bụ site na nyochaa usoro iwu nke ga-enye anyị ohere ijide onwe anyị.

O kwuru, sị, “Ọ bụghị ihe kwesịrị ekwesị inwe ndị gọvanọ dị ka ndị isi ọrụ nchekwa na-enweghị njikwa nke ọ bụla n’ime ụlọ,”

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *