Take a fresh look at your lifestyle.

Onye isi ala Tinubu na-anabata Gọvanọ steeti Enugwu.

Timothy Choji, Abuja dere ya na bekee

0 357

Onye isi ala Tinubu na-anabata Gọvanọ steeti Enugwu
Onye isi ala Bola Tinubu n’ụbọchị Fraide zutere Gọvanọ Peter Mbah nke Steeti Enugu na Abuja.

Ndị nta akụkọ bịakwutere Gọvanọ na ngwụcha nzukọ ahụ mana ọ jụrụ ikwu okwu.

Otú ọ dị, a na-atụ anya na mkparịta ụka ya na onyeisiala metụrụ aka na mmepe na nchekwa nke steeti Enugwu.

Gọvanọ Mbah oge o were ọchịchị ya gosipụtara nay a ga-agbanwee Enugwu site na ngalaba ọha gaa na akụ na ụba nke onwe site na ntinye ego nke ụlọ ọrụ nkeonwe.

Oge ikpeazụ aka na-achị steeti Enugwu gara leta onyeisiala, ọ kparịtara okwu gbasara onye ndu ndị Indigenous People of Biafra, IPOB, Nnamdi Kanu na ntọhapụ ya n’ụlọnga.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *