Take a fresh look at your lifestyle.

Ndị a na-achọ achọ n’ihe mberede ọkụ ọgbụgba na Hawaii ruru 1,300

0 421

Otu nwoke na-achọ ozu nwa ya nwoke nwụrụ n’ọkụ gbara n’ụlọ ha na Lahaina n’ụbọchị iri na out nkeonwa Ogustu

O meela ihe dịka otu izuụka kamgbe ihe mberede ọkụ ọgbụgba dakwasara mpaghara Hawaii nke mba Amerịka, mana ruo ugbua, ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n’ọkụ ahụ edochabeghị anya.

Ọnụọgụgụ ndị a ma nwụrụla n’ọkụ ahụ ugbua dị otu nari na otu, n’ime ha, naanị mmadụ atọ ka a matarala ndị ha bụ.

Mana ihe ruru mmadụ otu puku na nari ato ka a ka na-achọ achọ, dịka ndị ezinụlọ ha chị obi n’aka ịmata ọnọdụ ha, ebe ndị ọrụ gbatagbata ji nkịta ndị e nyere ọzụzụ pụrụ iche na-achọ ma ha a ga-ahụ ozu ndị ka nọ n’ime ọkụ.

Gọvanọ Hawaii bụ Josh Green gwara ndị ntaakụkọ n’ụbọchị Mọnde na ọ ga-eru ụbọchị iri tupu ha enweeike ịmata kpọmkwem mmadụ ole nwụrụ n’ihe mberede a.

Ka ọ dị ugbua ikuku dị na mpaghara ahụ ugbua adịchaghị mma mmadụ ikuru ya, nke mere ọrụ ndị gbatagbata ji nwayọ nwayọ aga.

Ịchọta ozu ndị nwụrụ n’ọkụ ọgbụgba a bụ ihe siri nnukwu ike, mana ndị ọkachamara na-ekwu na ọ bụrụgodi na a chọta ozu ndị nwụrụ anwụ, ịchọpụta ndị ha bụ kpọmkwem ga-akacha sie ike.

“Ọkụ agbariela ọtụtụ ihe n’ahụ ndị a nke ga-eme ka nnyocha DNA raa nnukwu ahụ. Ọ bụrụgodi na i nweta akụrụngwa nke i nwereike iji mee nnyocha DNA, ọ ga-adịkwa mkpa inweta ndị a ga-eji tụnyere DNA ahụ. Mana ọ bụladị nke a, ọ bụrụ na ụmụnne abụọ nwụrụ n’ọkụ ahụ, i nwereike ime nnyocha ma chọpụta na mmadụ abụọ ahụ bụ ụmụnne, mana ị gaghị enweike ịkọta onye bụ onye n’ime ha abụọ,” Chris Milroy, bụ ọkammụta na ngalaba pathology na mahadum Ottawa gwara ndi ntaakuko.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *