Ndị ọrụ ahụike a kpọrọ Nigerian Association of Resident Doctors (NARD) akagbuola ngagharịiwe ha chọburu imalite taa bu Wenezde abali itolu nke onwa Ọgọọst, 2023.
Onyeisi ha bụ Innocent Orji kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ụlọọrụ Channels TV nwere n’ụtụtụ Wenezde.
O kwuru na agbanyeghi nke a na abụbụọrụ ha malitere ịgba kamgbe ka ga-aga n’ihu.
“N’ezie anyị akagbuola ngagharịiwe ahụ kwesịrị ịkwụsị taa mana abụbụọrụ anyị ka na-aga n’ihu. Anyị ga-eleba ya anya ọzọ n’ime ụbọchị atọ; nke a bụ ebe ndịisi anyị kwụụ”.
Orji kwuru na ọ bụ ihe asatọ ka ndị otu ha na-achọ n’aka gọọmentị nke gụnyere mkpa ọ dị ka gọọmentị were ndị ọhụrụ n’ọrụ iji dochie anya ndị ahụ pụrụ apụ.
“Ndị ọrụ anyị na-ata ahụhụ, ndị Naịjirịa na-atakwa ahụhụ. Mgbe e nweghi ndị ọrụ ahụike zuruoke n’ụlọọgwụ, enweghi etu ị ga-esi nwee ezi ahụike zuruoke. O nwegbeghi onye bịara kwuo na ihe a abụghị eziokwu.”
“Gọọmentị kwuru na ha hiwere kọmitii ga-eleba anya n’usoro a ga-eji were ndị mmadụ n’ọrụ kamgbe Febụwarị afọ a, gịnị mere na o nwebeghi ozi e wepụtara banyere ya?” o kwuru na ọ bụ ihe ndị a mere ndị ọrụ ahụike ji na-ahapụ Naịjirịa apụ.
Orji kwuru na gọọmentị egosibeghi na ha chọrọ ime ihe ọbụla banyere ihe ndị dọkịta a na-achọ.
Leave a Reply