Take a fresh look at your lifestyle.

Ihe ga-emezi ugbua dịka oge Ecowas nyere ndịagha Niger gwụrụla

0 285

Ndị ndu otu Economic Community of West African States (Ecowas) ekwuola ha ga-eme ọgbakọ n’ụbọchị Tọzde 10 Ọktoba, 2023 n’Abuja banyere ihe ha ga-eme maka ndịagha weere ọchịchị n’ike na mba ahụ.

Nke a na-abịa dịka ụbọchị asaa ha nyere ndịagha Niger iji weghachị ọchịchị n’aka onyeisiala ha chụpụrụ gwụrụla.

Ecowas kwuru na ọ bụrụ na ha enyeghachịghị Mohamed Bazoun ọchịchị na ha ga-eme ihe ọbụla ha kwesịrị nke gụnyere iji ndịagha amanye ha n’ike.

Ndịagha Niger kwuru na ha agbachiela ihueliugwe ha ka ụgbọelụ ọbụla ghara ifepu maọbụ febata na mba ha.

Ugwu ndị Ecowas nọ na nkiri ugbua maka na ha ṅụrụ iyi na ndịagha agaghị ewere ọchịchị n’ike ọzọ.

Na Naịjirịa bụ ndị agbataobi Niger, ọtụtụ ndị mmadụ na-akpọku ka Ecowas were mkparịtaụka udo mezie nsogbu a ma ghara ibuso Niger agha.

N’otu aka ahụ gọọmentị mba Italy na Germany akpọkuola ndị ndu Ecowas ka ha gbatịa oge ha nyere ndịagha Niger iweghachị ọchịchị n’aka onyeisiala Mohamed Bazoum.

Praịm minista mba Italy gwara ndị ntaakụkọ na ọ bụ naanị otu ihe ka e ga-eme nke bụ isoro ụzọ udo.

N’otu aka ahụ minista Germany na-ahụ maka ihe na-eme na mba ndị ọzọ akpọọla oku ka e were ụzọ udo na-abụghị ịlụ agha.

Ecowas akatọọla iwere ọchịchị n’ike ndịagha merela n’ihe ruru ugboro asaa kamgbe afọ atọ.

 

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *