Take a fresh look at your lifestyle.

Mmachi mkpagharị na steeti Adamawa.

CHIGO.

0 331

Gọvanọ Adamawa Steeti bụ Ahmadu Umaru Fintiri etinyela ọnọdụ mmachi mkpagharị na steeti ahụ niile, dịka ụfọdụ ndị mmadụ wakporo ụlọ nchekwa nri dị icheiche ma ndị nke gọọmentị nwe ma ndị nke ndị nkịtị nwe.

Akụkọ kwuru na igwe mmadụ malitere ịkpagharị n’ụbọchị Sọnde na-akụka ụlọ ebe gọọmentị na-echekwa ihe oriri nakwa ụlọ ahịa ndị mmadụ na-ere ihe oriri na ihe ndị ọzọ, ma na-ebukọrọ ihe niile ha nwere ike.

“Gọvanọ Fintiri na-etinye ọnọdụ mmachi mkpagharị a n’ihi etu ụfọdụ ndị omekome si jiri mma na-awakpo ndị mmadụ na mpaghara dị icheiche ma na-ebukọrọkwa ihe ha,” akwụkwọ ozi ahụ kwuru.

“Nke a pụtara na agaghị enwe mkpagharị ọbụla na Adamawa Steeti niile ogologo ụbọchị niile.

“Naanị ndị na-arụ ọrụ dị mkpa ga-enwe ike ịkpagharị n’oge a, mana ha ga-eji akwụkwọ njirimara ga-egosi na ha na-arụ ọrụ dị mkpa.

“Gọvanọ na-arịọ ndị niile bi na steeti a ka ha rube isi n’iwu a maka na onye ọbụla a hụrụ ka ọ na-enupu isi, a ga-ejichi ya ma nye ya ntaramahụhụ siri ike dịka iwu si dị.”

N’otu aka ahụ kwa, ndị uweojii Adamawa Steeti wepụtakwara akwụkwọ ozi iji dọọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha rube isi n’iwu mmachi mkpagharị ahụ ma sepụ aka n’ihe ọbụla nwereike ibute ọgbaaghara.

Kọmishọna ndị uweojii Adamawa Steeti bụ Afolabi Babatola kwuru na ya ezipụla ndị uweojii site na ngalaba dị icheiche iji hụ na onye ọbụla rubere isi n’iwu mmachi mkpagharị nke gọọmentị tinyere.

BBC IGBO

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *