Take a fresh look at your lifestyle.

Gọvanọ Zulum wepụrụ onye kọmishọna ahọpụtara.

AMAKA NLIAM sere ya na bekee.

0 267

Gọvanọ Zulum wepụrụ onye kọmishọna ahọpụtara.

Gọvanọ Babagana Zulum nke steeti Borno  edegara ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti akwụkwọ, iwepụ Dr Ibrahim Ngoshe nhọpụta dịka kọmishọna.

A ga-echeta na Zulum n’abalị iri abụọ na asatọ n’ọnwa Julaị, zigara ndị ụlọ omebe iwu aha ndị omeiwu ya họpụtara maka nyocha na nkwado.

Ọnụ na-ekwuchitere Gọvanọ, Mallam Isa Gusau, bụ onye kwupụtara nke a na nkwupụta e wepụtara na Satọdee na Maiduguri, isi obodo steeti ahụ, kọwara na site na nke a, ọnụ ọgụgụ ndị a họpụtara ahọpụta kọmishọna gbadara site na 18 ruo 17.

Gusau kwuru na a ga-enye nkọwa ndị ọzọ ma ọ dị mkpa .

Ngoshe bụ onye nke13 na ndepụta mbụ nke Gọvanọ nyefere n’ọgbakọ.

Onye nhọpụta a ka ga-emeghachi omume na mmepe ahụ, n’agbanyeghị na amabeghị ma okwu Ngoshe na Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) kpalitere ihe gọvanọ mere.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *