Ọrịa ndị okenye ndị ntorobịa na-arịazị ugbua
Ọbara mgbali elu: Nkea bụ ọrịa ndị dibịa Bekee na-akpọ ‘high blood pressure’. Ọ bụ mgbe ọbara na-agbasị ike n’akwara karịa 140/90, ọ na-aka njọ ma ọ karịa 180/120.
Ọrịa mkpụrụ obi: Ọ bụ ọrịa mkpụrụobi mmadụ nke ọtụtụ ọrịa dịgasi icheiche nwereike ịkpata.
Ọrịa mkpọnwụ ahụ: Nke a bụ ọrịa na-eme mgbe oke ọbara anaghị eruzi ụbụrụ.
Ọrịa nsekpọ ụbụrụ (Alzheimers) – Ọ bụ ọrịa sị na mgbe mmadụ enweghi ike icheta ihe maọbụ ọrụ ndị ọzọ ụbụrụ na-arụ.
Mgbujiri/Ọrịa ikpere (Arthritis/Rheumatism) – Ndị ọkachamara n’ihe gbasara ahụike kwuru na ọrịa a nwereike ibido n’ahụ onye dị site n’afọ 17 gbagowe. Ọ na-eme mgbe njịkọ ọkpụkpụ mmadụ ga-aza nke agahị ekwe ka o megharịa ya.
Ọrịa akpụ/Kansa – Teknụzụ emeela ya na ugbua, a na-achọpụtanwịzị ya ma n’ụmụaka, ntoroọbịa na ndị okenye. Ọ bụ ọrịa nke na-eme ka ọwọ njọ ga na-eto n’ahụ mmadụ nke ga-arịagbu ọkpụ ọwọ n’ahụ onye ahụ.
BBC IGBO.
Leave a Reply