Take a fresh look at your lifestyle.

Stella Oduah abịala n’ụlọikpe ịzara ọnụ ya maka ebubo nrụrụaka EFCC na-ebo ya.

chigo dere ya n'Igbo.

0 293

Stella Oduah abịala n’ụlọikpe ịzara ọnụ ya maka ebubo nrụrụaka EFCC na-ebo ya.

Stella Oduah, bụbu Mịnịsta na-ahụ maka njem ụgbọelu na Naịjirịa, bịara n’ụlọikpe ukwu dị n’Abuja taa bụ Fraịde, Julaị 21 2023, ịzara ọnụ ya maka ebubo nrụrụaka nke ngalaba EFCC na-ebo ya.

EFCC boro ebubo na Oduah na mmadụ asatọ ọzọ mere nrụrụaka n’ego gọọmentị ruru ijeri naịra ise (N5b) oge ọ bụ Mịnịsta.

Oduah na ndị ọzọ e boro ebubo ahụ bịara n’ihu ọkaikpe Inyang Ekwo ma kwuo na ebubo ahụ abụghị eziokwu.

Mmadụ asatọ ndị ọzọ EFCC boro ebubo a gụnyere Gloria Odita, Nwosu Emmanuel Nnamdi, na Chukwuma Irene Chinyere.

Ndị ọzọ bụ ụlọọrụ ‘Global Offshore and Marine Ltd’; ‘Tip Top Global Resources Ltd’; ‘Crystal Television Ltd’; ‘Sobora International Ltd’; na ‘China Civil Engineering Construction Corporation’ (CCECC) Nigeria Ltd.

EFCC gbara ha akwụkwọ kamgbe afọ 2020, akara ikpe ahụ bụ ‘FHC/ABJ/CR/316/2020’, mana ikpe ahụ amaliteghị ruo ugbua, dịka afọ atọ gachara.

Stella Oduah rụkwara ọrụ dịka Sinetọ nọchitere anya mpaghara Anambra North n’ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa.

N’ọnwa Eprel 2018, Mịnịsta mgbasaozi Naịjirịa n’oge ahụ bụ Lai Mohammed, wepụtara aha ndị gọọmentị boro ebubo nrụrụaka nakwa izu ego gọọmentị.

Aha Stella Oduah bụ nke itoolu n’akwụkwọ ahụ dịka gọọmentị boro ya ebubo nrụrụaka ego ruru ijeri naịra itoolu na ụma asatọ.

BBC IGBO.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *