Take a fresh look at your lifestyle.

Esemokwu ókèala Cameroon na Naijiria.

Gloria Essien, Abuja dere ya na bekee.

0 218

Esemokwu ókèala Cameroon na Naijiria.
Ụlọ ndị nnọchiteanya kwuru na ha ga-enyocha ma dozie nsogbu nke ala n’etiti Naijiria na agbata obi ha Cameroon.
Onye isi oche kọmitii Adhoc na esemokwu oke ala mba ụwa dị n’etiti Nigeria na Cameroon, Rep. Beni Lar kwuru nke a na ikpe nyocha nke kọmitii ahụ.
Rep. Lar kwuru na obi adịghị ya mma na ọ ga-abụ ihe jọgburu onwe ya ikwe ka obodo ndị ọ metụtara hapụ obodo ha masịrị ha n’ihi na ọ megidere ikike ha dị ka ụmụ amaala Naijiria.
Ọ sịrị: “A ga-enwerịrị usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị maka okwu a. A ga-enwerịrị ụzọ iji dobe ụmụnna anyị ndị nọ na Nigeria site n’imezi ihe kwesiri ekwesi.
“Apụghị m iche n’echiche na m ga-eteta ma gwa gị na ị bụghị onye Naijiria. Kedu ka ọ ga-adị gị? a ga-enwerịrị ụzọ ebe a ga-esi dozie okwu a.”

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *