Take a fresh look at your lifestyle.

Anyị nwere ala maka ndị chọrọ iwu ụlọọrụ – Soludo

chigo.

0 371

Anyị nwere ala maka ndị chọrọ iwu ụlọọrụ – Soludo.

N’ọgbakọ ahụ nke ọtụtụ ndị ọchịchị si Anambra Steeti sonyere na ya, Soludo kwere nkwa na gọọmentị ga-enye ndị ọbụla chọrọ ihibe atụmatụ ịchụta ego n’Anambra steeti nkwado niile ha chọrọ.

“Anyị nwere atụmatụ iji hụ na onye ọbụla chọrọ ihibe ụlọọrụ n’Anambra Steeti ga-enweta ala iji mee nke a na-enweghị nsogbu ọbụla,” ka o kwere nkwa.

“Anyị na ụlọọrụ ‘Enugu Electricity Distribution Company’ (EEDC) na-arụkọ ọrụ iji hụ na ọkụ latrik anaghị anyụ anyụ ọ bụlagodu n’obodo anọ mepere n’Anambra bụ Ọka, Ọnịcha, Nnewi na Ekwulọbịa.”

Soludo kwukwara na ọchịchị ya na-agba mbọ iwulite Ọnịcha ka ọ bụrụkwa obodo a na-akwanyere ugwu dịka ọ dịbu n’oge mbụ.

O kwukwara na ha na-agba mbọ ijikwa mbuze na-enye nsogbu na mpaghara dị icheiche na steeti ahụ dịka Oko, Nanka, Ekwulobia, Oba, na ndị ọzọ.

bbc igbo

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *