Take a fresh look at your lifestyle.

Onyeisiala enyela iwu ka e megharịa atụmatụ inye ndị ogbenye N8000 na Naịjirịa

0 256

Onyeisiala Bola Tinubu enyela iwu ka e cheregharịa echiche banyere atụmatụ gọọmentị inye ezinaụlọ nde iri na abụọ na-enweghi ka ọ hara ha dọla iri ruo afọ isii iji belata ihe isi ike so mwepụ ego mbelata mmanụ ụgbọala.

Nke a na-abịa dịka ọtụtụ nkatọ malite ịpụta maka atụmatụ a dịka ụfọdụ kwuru ya bụ ego pere mpe.

Ọnụ na-ekwuru onyeisiala Tinubu bụ Dele Alake kwuru na Onyeisiala Tinubu nyere ntuziaka ka “etinyeanya ma megharịa atụmatụ ego puku naira asatọ bụ nke e wepụtaburu iji nyere ezinaụlọ ndị na-enweghi ka ọ hara ha aka”

Ọ gara n’ihu kwu na nke a so “ọtụtụ echiche ụmụafọ Naịjirịa kwupụtara megide atụmatụ a”.

Onyeisiala gakwara n’ihu kwuo ka a gbaa n’anwụ ihe ndị ga-anọ n’ime akpa ihe enyemaka gọọmentị chọrọ inye ụmụafọ Naịjirịa.

O nyekwara iwu ka enye ndị ọrụ ugbo mmadụ nde iri ise fetilịaza ngwa ngwa nakwa mkpụrụosisi dị iche iche.

Cheta na Tinubu gwara ndị ụlọomeiwu n’ụbọchị Tọọzde gara aga ka ha binyeaka n’akwụkwọ o zitere ha nke na-arịọ ka e bite nde dọla nari asatọ bụ nke gọọmentị akachibụrụ Naịjirịa Muhammadu Buhari nabatara.

Ego a bụ nke e kwuru a ga-eji kwalite atụmatụ inye na-enweghi ka ọ hara ha ihe enyemaka dị icheiche.

Ego ime njem nakwa ọnụahịa ngwa nrị agaala n’ihu na-arị elu n’akụkụ Naịjirịa dị iche iche kemgbe e wepụrụ ego mbelata mmanụ ụgbọala ala na ngwụcha ọnwa Mee.

Gọọmentị Naịjirịa etinyela ọnọdụ gbata gbata n’okwu ikwalite nri na akụmakụ dị ọnụahịa mmanụ ụgbọala riri elu ruo pasentị iri abụọ na abụọ. Iri elu ihe ahịa na Naịjirịa ugbua eruola pasentị iri abụọ na abụọ na uma asaa mana ọnụego ụgwọ ọnwa opekatampe ndị mmadụ ka nọ na pukuk naira iri atọ(N30,000).

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *