Take a fresh look at your lifestyle.

NNPC ekwuola ihe mere ọnụego mmanu ụgbọala jiri rịa elu orji

0 470

Mele Kyari bụ onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka mmepụta mmanụ agbidi na Naịjirịa a kpọrọ Nigeria National Petroleum Company (NNPC) ekwuola ihe mere ọnụego mmanụ ụgbọala ji ‘rịa eli orji’ ugbua.

Kyari mgbe o zutere osote onyeisiala Naịjirịa bụ Kashim Shettima na Tuzde n’Abuja kwuru na ọ bụ etu ndị na-ebubata mmanụ ụgbọala si azụta ka ha jikwa ere.

O kwuru site n’aka gọọmentị sepuru n’ibubata mmanụ ụgbọala, na o mere ka ọnụego ya rịa elu oge ụfọdụ maọbụ gbatuo ala.

O kwuru na mbulie elu mmanụ ụgbọala site na N500 ruo N617 abụghị maka ụkọ mmanụ a, na ka nwere mmanụ ụgbọala ebe o buru ibu.

O kwuru na ọ bụ ngalaba azụmaahịa ụlọọrụ NNPC ka ọ dị n’aka itinye ego n’ọnụ ahịa mmanụ ụgbọala, na ha na-eme nke a site n’etu ahịa siri dị.

“Nke a bụ ihe na-eme; ọ ga-eme ka ọnụego mmanụ ụgbọala rịa elu oge ụfọdụ ma gbatuo ala oge ụfọdụ.”

Ọ gara n’ihu kwuo na ha nwere mmanụ ụgbọala ga-ezuru ndị Naịjirịa ruo ụbọchị iri atọ na abụọ, na mmanụ a akọghị ụkọ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *