Take a fresh look at your lifestyle.

Ụlọomeiwu Naịjirịa ga-enyocha ndị isi ọrụ nchekwa Naịjirịa taa

0 211

Ụlọọmeiwu Naịjirịa ga-enyocha ndị isi ọrụnchekwa Naịjirịa ọhụrụ taa bụ Mọnde abalị iri na asaa nke ọnwa Jụlaị, 2023.

A na-atụ anya na nnyocha ga-abụ ihe agaghị agba n’anwụ.

Nnyocha ga-ada n’isi ndị ọrụ nchekwa ọhụrụ a onyeisiala Bola Ahmed Tinubu were họpụtara na nso nso a, ndị bụ:

  • Ọchịagha Taoreed Abiodun Lagbaja (onyeisi ndịagha ala)
  • Ọchịagha Christopher Gwabin Musa (Onyeisi nchekwa)
  • Ọchịagha Emmanuel Ikechukwu Ogalla (onyeisi ndịagha mmiri)
  • Ọchịagha Hassan Bala Abubakar (onyeisi ndịagha ụgbọelu)

Nke a ga-eso nabata aha ndị ụlọomeiwu mere maka ndị a n’ụbọchị Tọọzde gara aga.

Onyeisi ụlọọmeiwu Naịjirịa bụ Godswill Akpabio gbara ama na ndị isi ọrụ nchekwa a zara ajụjụ banyere ọrụ nchekwa nakwa ihe ndị ọzọ dị mkpa.

Onyeisiala zigaara ndị ụlọomeiwu ozi n’ụbọchị Mọnde gara aga na-arịọ ka anabata ma binyeaka n’ọrụ ndị a.

N’ụbọchị Tọọzde, ndị ụlọomeiwu ji nnyocha ndị isi ọrụ nchekwa Naịjirịa malite ọrụ dịka ya bụ ndị a na-enyocha pụtara n’otu, n’otu kwuo etu ha ga-esi buso enweghi nchekwa agha na Naịjirịa.

Nke a na-abịa n’oge ndakpọ ọnọdụ nchekwa Naịjirịa so n’ihe mbụ ga-echere ya aka mgba.

Onyeisiala ọhụrụ Naijirịa ekweela nkwa ikwalite ọrụ nchekwa Naịjirịa site na iwe ọtụtụ ndịagha n’ọrụ, ịzụtara ndịagha ọtụtụ ngwa ọgụ ha ga-eji rụọ ọrụ nakwa ihe ndị ọzọ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *