Take a fresh look at your lifestyle.

Mmadụ asaa anwụola na mwakpo ụlọakwụkwọ ọtaakara Lianjiang

0 322

Mmadụ asaa anwụọla nke gụnyere ụmụaka anwụọla n’ụlọakwụkwọ ọtaakara ebe a sụrụ ndị mmadụ mma n’akụkụ ndịda China bụ mpaghara Guangdong.

Ndị uweojii na-ekwu na ha anwụchila otu nwoke dị afọ 25 nke aha nna ya bụ Wu n’obodo Lianjiang.

Ndị ọzọ a zụgburu n’ụlọakwụk,wọ a gụnyere otu onye nkuzi, na nne na nna abụọ dịka ụlọ ntaakụkọ AFP siri kwuo dịka ha kọwara na ọ bụ otu onye ọchịchị mba ahụ gbara ama nke a.

E kwukwara na otu onye merụrụ ahụ na mwakpo a.

Ndị uweojii kọwara na ihe bụ mwakpo “a ma ụma mee” mana ha akọwabeghi kpọm kwem ebumnobi onye mere ya bụ mwakpo.

Mwakpo a mere n’isi ụtụtụ Mọnde a n’ebe elekere asaa na nkeji 40 nke ụtụtụ dịka ndị nne na nna nọ na-ebubu ụmụ ha n’ime ụlọakwụkwọ. A nwụchiri ya bụ nwoke a na-enyo n’okwu a n’ebe elekere asatọ nke ụtụtụ a.

Ndị bi n’obodo Lianjiang ruru otu nde na ụma.

Dịka ihe onyonyo banyere mwakpo a na-efesa na soshal midia China, ọtụtụ egosila iwe ha ebe ndị ọzọ na-ama jijiji.

Nke a so ụdịrị mwakpo malitere iri elu na nso nso na mba a bụ mwakpo ịsụ mma dịka a machiri ndị nkiti ibu egbe na mba ahụ.

Chetakwa na nso nso a, otu onye wakporo otu ụlọakwụkwọ ma gbaa ụmụakwụkwọ ruru 50 tụsa tụsa kemịkal nke merụrụ ha ahụ.

Ngụkọ ndi nta akuko egosila na mwakpo e ji mma mee ruru 17 emeela n’ọtụtụ ụlọakwụkwọ prịmarị, sekọndịrị nakwa mahadum malite n’afọ 2010 ruo ugbua na mba ahụ.

Iri n’ime ha mere n’agbata afọ 2018 ruo 2023.

Ndị ọchịchị China na-agbasi mbọ ike ichekwa gburugburu ụlọakwụkwọ ha kemgbe 2010. N’afọ ahụ, Ministri nchekwa obodo gbara ndị ọchịchị obodo ume ka ha “kwụsie ike na mbuso agha” nye ndị na-eme mwakpo a iji hụ na e chekwara ndị nkụzi na ụmụakwụkwọ.

Mgbe mwakpo Eprel 2021 gasịrị, ministri agụmakwụkwọ mba ahụ nyekwara iwu ka amalite ime ọzụzụ maka usoro mbupụ ụmụakwụkwọị n’ụlọ akwụkwọ ma ihe mberede mee.

N’ịtụ egwu na mwakpo mpaghara ndị ọzọ ga-amụta agwa mwakpo a, mba China anaghị ekwe ka ụlọọrụ mgbasaozi ha bipụta akụkọ nkọwa zuruoke maka mwakpo Mọnde a mere n’ụlọakwụkwọ ọtaakara a

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *