Take a fresh look at your lifestyle.

Tariff increases: Tinubu, ụmụ Naijiria na-ekubizi ume n’ihi ụfọdụ atụmatụ gị- Afenifere

0 203

Otu jịkọrọ ndị Yoroba a kpọrọ Afenifere akpọkuola onyeisiala Bola Ahmed Tinubu ka o jiri ọsọ kwụsị atụmatụ itinye ego n’ụgwọ ọkụ latrik nakwa itinye ụtụisi maka ndị nwere ụgbọala na “atụmatụ mmekpa ahụ” ndị ọzọ Gọọmentị na-akwado itinye.

Ozi nke odeakwụkwọ mgbasaozi otu Afenifere bụ Jare Ayayi binyere aka ma zitere NDI NTA AKUKO Igbo n’ụbọchị Tozde kwuru na nke ga-eme ka ọnọdụ ihe isi ike nke ụmụ Naijiria nọ na ya kawanye njọ.

Ajayi, onye sịrị na nnu na-achọzị ịṅa ofe kwuru sị, “Afenifere tooro ụfọdụ nzọpụ ụkwu nke ọchịchị Tinubu zọpụrụ n’ime otu ọnwa o jiri banye n’ọkwa maka na ha nwere ike ịkwalite ụmụ Naijiria n’ọdịnihu mana ọ dị mkpa ịhụ na ndị mmadụ ekubighị tupu ihe ọma a na-atụ anya ya abịa ,ṅdị mmadụ na-ekubizi ume n’ihi ụfọdụ atụmatụ Tinubu.”

Afenifere rụtụrụ aka na “ndị ụlọọrụ na-ekesa ọkụ latrik bụ ‘Electricity Distribution Companies’ (Discos) mara ọkwa na ha ga-eji pasent 40% bulie ego ọkụ latrik malite n’abalị mbụ nke ọnwa Julai, afọ 2023.

“N’otu aka ahụ ụlọọrụ Gọọmentị Etiti na-anakọ ụtụisi bụ Federal Government Joint Tax Board’ kwukwara na onye ọbụla nwere ụgbọala ga-amalite ịkwụ otu puku naira kwa afọ iji nweta asambodo na-egosi na ọ bụ ya nwe ụgbọala.”

Afenifere bụ ndị gbarụrụ ihu maka atụmatụ ndị a,sịrị na e nwelarị ụtụisi dị iche iche ụmụ Naijiria na-akwụ dịka akwụkwọ ikike ịkwọ ụgbọala, akwụkwọ ụgbọala tozuru ịgba n’okporoụzọ.

Afenifere katọkwara atụmatụ ọhụrụ nke Ụlọakụ Etiti (CBN)wepụtara nke nyere ndị ụlọakụ ọha iwu ka ha nata ndị ahịa ha akara soshal midia ha, sị na nke a bụ ụlọọrụ gọọmentị ịta ndị mmadụ ahụhụ maka gọọmentị ịkpụ afọ n’ala n’ọrụ ha.”

Otu ahụ rụtụrụ aka na-agbanyeghị na gọọmentị tinyere iwu ka onye ọbụla nwere ekwentị tinye akara njirimara nwamala bụ ‘National Identity Number (NIN)’ na akara ụlọakụ ya Bank Verification Number (BVN), sị na ọ bụ ụzọ ha ga-esi ebelata nsogbu ndị ntọ, na nsogbu ndị ntọ ka na-aga n’ihu kemgbe afọ anọ e tinyere ya bụ iwu.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *