Take a fresh look at your lifestyle.

Ike Ekweremadu: Nna nwata ahụ ọ tụrụ mgbere gaa Briten akwaala arịrị ma daa n’ute ọrịa

0 242

Ndi nta akuko achọpụtala ihe omimi ọhụrụ banyere etu e jiri si na Naịjịrịa tụọ otu nwata nwoke mgbere gaa mba Briten. Nke a bụ mbụ mba Briten na-ama mmadụ ikpe maka ịtụ mmadụ mgbere maka atụmatụ ịwara ime ahụ ya.

Nnyocha a chọpụtara na ezinaụlọ nwata nwoke ahụ a tọrọ mgbere gaa Briten nọzị n’arịrị kemgbe. Nwanne ya nwoke gwara ndi nta akuko na “Ezinaụlọ anyị niile na-ebe akwa kemgbe dịka nna anyị akwaala arịrị nke ukwuu ma daa n’ute ọrịa”.

Ike Ekweremadu onye bụbu sịnetọ n’ụlọọmeiwu Naịjirịa natara ntaramahụhụ maka okwu a dịka ya bụ okwu dakwasịrị ya, nwunye ya nakwa otu nwoke ọzọ n’isi.

E jidere Ekweremadu na nwunye ya na Briten n’ụbọchị 23 nke ọnwa Juun 2022 maka ebubo ịtụ mgbere ime ahụ mmadụ.

E mechara maa Ekweremadu, nwunye ya bụ Beatrice, na otu dọkịta aha ya bụ Obinna Obeta, ikpe n’ụbọchị Fraịde, bụ ụbọchị ise nke ọnwa Mee, maka okwu ịgba ohu ọgbara ọhụrụ nakwa ịtụ mgbere akụkụ ahụ mmadụ.

Otu ikpe kpere ikpe Ekweremadu chọpụtara na o so hiwe iwu mere ka ịtụ mgbere ahụ mmadụ bụrụ ịda iwu megide Naịjirịa.

Nwata nwoke ahụ, onye na-azụbu ahịa na Legọs abụrụla onye na-agbazi ọsọ ndụ ya maka egwu na ihe nwereike ime ya ma ọ lọghachite Naịjirịa.

N’ime akụkọ a, anyị ga na-akpọ nwata ahụ ‘Daniel’.

Nwanne ya nwoke onye gwara ndi nta akuko Igbo okwu, rịọkwara ka a ghara ịgba ya n’anwụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *