Dịka a malitere ikpe dị n’etiti Peter Gregory Obi nke Labour Party na INEC, Tinubu, Shettima nke APC taa bụ Tọzde, otu Labour Party akpọọla ndị aka ebe ọhụrụ ụbọchị Wenezde.
Labour Party kpọrọ Dr. Chibuike Ugwuoke, bụ onye ọkacharamara n’ihe gbasara ichekwa ọbaozi intanet(cyber security expert) akaebe.
Pati ahụ kpọkwara Onoja Oloko Sunday, bụ onye na-arụ ọrụ n’ụlọọrụ na-agba mbọ maka ikike dịịrị onye a kpọrọ, “Woman and Child Rescue Initiative,akaebe.
Oloko rụrụ ọrụ dika onye gagharịrị ịhụ ka ntuliaka si aga(election observer) n’oge ntuliaka 2023.Labour Party kpọkwara Kephas Iya bụ onye ọrụ oyibo rụrụ ọrụ dịka onye ọrụngo Inec n’oge ntuliaka.
Iya rụrụ ọrụ dịka ‘supervising presiding officer.’
Nwamadi ahụ gwara ụlọikpe na onye ọrụ Inec ọzọ a kpọrọ Sulieman Mustapha, gara n’ọgbọ atụmvootu 24 dị na wọọdụ ha.
Ọ sịrị na ewezụga okwu dapụtara n’etiiti ndị ogeozi PDp na nke ndị APC, na o nweghị nsogbo ọzọ e nwre karịa izipụ mpụtara ntuliaka.
Labour Party wetekwara ihe akaebe nke gụnyere; akwụkwọ gosiri mmadụ ole debara aha ha maka atụmvootu nakwa ndị natara PVC ha na steeti 32 nke si n’aka Inec; akwụkwọ gosiri n’ Edo INEC; akwụkwọ ozi si igwe ‘IREV nke ọkpụrụ ọchịchị atọ na Benue steeti; akwụkwọ ozi si IREV nke okpuru ọchịchị abụọ nna Rivas steeti;akwụkwọ ozi si Irev maka Okpuru Ọchịchị 12 na Legọs steeti; akwụkwọ ozi nke IREV maka otu Okpuru Ọchịchị na Gombe steeti.
Ndị a gbara akwụkwọ(Inec, Tinubu nakwa APC) jụrụ sị ka a ghara ịnabata ihe akaebe ndị a mana ụlọikpe gara n’ihu nabata ha.
Leave a Reply