Ụmụaka ndị a kpụ abụ ụka n’ọnụ mgbe ndị ekperima wakporo ma gbuo ha Ka mwakpo a tara isi mmadụ 40 mechara, Mary Masika gwara ndi nta akuko na “a nụrụ olu ndị na-eti mkpu”.
A na-arụ ndịagha nnupụisi ụka alakụba aka maka mwakpo a.
Otu ‘Allied Democratic Forces’ (ADF) e hibere n’ebe 1990 malitere buwe ngwa ọgụ dịka ha na-ebo ebubo na a na-akpagbu ndị okpukperechi alakụba ebe ahụ.
Ugbua, ndị a kwunyeziri onwe ha n’akụkụ mba Democratic Republic of Congo.
Ụlọakwụkwọ Mpondwe Lhubiriha Sekọndịrị bụ ebe mwakpo a mere na Fraịde nọ nso okeala mba abụọ a.
Masika kwuru na mwakpo a mere ruo nkeji 90 emeela ka ya na ndị ọzọ bi nso ebe ahụ maa oke jijiji.
Leave a Reply