Take a fresh look at your lifestyle.

Gọọmentị Legọs ebidola ikuri ụlọ dị icheiche na mpaghara ahịa Alaba

0 526

Gọọmentị Legọs Steeti amalitela ikuri ụfọdụ ụlọ na mpaghara ahịa Alaba International Market n’ụbọchị Sọnde, dịka ha kwuru na ụlọ ndị ahụ emeela ochie, ma na-achọ ịda ada.
Nke a na-abịa dịka ụfọdụ na-akatọ atụmatụ ikutu ụlọ ndị a, ma na-ekwu na nke a gosiri mmegbu a na-emegbu ndị si mpaghara Ọwụwa Anyanwụ bi ma na-azụ ahịa na Legọs.
Mana gọọmentị Legọs na ndị isi otu jikọrọ ndị ahịa n’Alaba kwuru na ọ bụghị ahịa ‘Alaba International Market’ kpọmkwem ka a na-akutu, kama ọ bụ ụfọdụ ụlọ dị n’okirikiri ahịa ahụ bụ ndị esizighi ike.
Ụfọdụ ndị nkutu ụlọ a metụtara ụlọahịa ha gwara ndi nta akuko na ọ bụ eziokwu na gọọmentị enyebuola ndị nwe ụlọ ndị ahụ akwụkwọ ịdọ aka na ntị, mana ha na gọọmentị na-enwe mkparịtaụka iji mara ihe ha nwereike ime iji gbochie nkụtu ụlọahịa ha.
ndị a gwara anyị na ha akwụọla ụgwọ ruru nde kwuru nde naịra n’aka ụfọdụ ndịọrụ Legọs steeti n’ihi okwu a.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *